21 “Gaanụ jụọ Jehova ase n’aha m nakwa n’aha ndị fọrọ n’Izrel na Juda. Jụọnụ ya gbasara ihe e kwuru n’akwụkwọ a a hụrụ, n’ihi na Jehova ga-ewesa anyị ezigbo iwe maka na nna nna anyị hà emeghị ihe Jehova kwuru. Ha emeghị ihe niile e dere n’akwụkwọ a.”+