24 Jehova gosiri m nkata abụọ a dọsara n’ihu ụlọ nsọ Jehova. Mkpụrụ fig dịkwa n’ime ha. O gosiri m ha mgbe Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn si na Jeruselem dọrọ Jekonaya+ nwa Jehoyakim+ bụ́ eze Juda n’agha laa Babịlọn, ya na ndị isi Juda, ndị omenkà, na ndị na-akpụ ụ́zụ́.+