20 Ihe mere ihe ndị a ji mee ndị bi na Jeruselem na ndị Juda bụ maka na ha nọ na-akpasu Jehova iwe ruo mgbe ọ chụpụrụ ha n’ihu ya.+ Zedekaya mechakwara nupụrụ eze Babịlọn isi.+
13 O nupụkwaara Eze Nebukadneza+ isi n’agbanyeghị na Nebukadneza mere ka o jiri Chineke ṅụọ iyi na ọ ga na-erubere yanwa isi. Ọ kpọrọ ekwo nkụ, kpọchie obi ya, jụkwa ịlọghachikwute Jehova bụ́ Chineke Izrel.