-
Ọpụpụ 13:17, 18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Mgbe Fero hapụrụ ndị Izrel ka ha gawa, Chineke edughị ha gaa n’ụzọ gawara n’ala ndị Filistia, n’agbanyeghị na ọ dị nso. N’ihi na Chineke sịrị: “Ọ bụrụ na a lụso ha agha, ha nwere ike ịgbanwe obi ha ma laghachi Ijipt.” 18 N’ihi ya, Chineke mere ka ndị Izrel si n’ụzọ ala ịkpa nke Oké Osimiri Uhie gaa gburugburu.+ Ma ndị Izrel haziri onwe ha ka ndị agha mgbe ha si n’Ijipt na-apụ.
-
-
Ọpụpụ 15:22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
22 Mosis mechara duru ndị Izrel si n’Oké Osimiri Uhie pụta. Ha wee banye n’ala ịkpa Shọọ. Ha gara ije ụbọchị atọ n’ala ịkpa ahụ, ma ha ahụghị mmiri.
-