13 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Hụnụ na unu na-edebe ụbọchị izu ike m,+ n’ihi na ọ bụ ihe na-egosi na mụ na unu agbaala ndụ n’ọgbọ unu niile, ka unu wee mara na ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, na-eme ka unu dị nsọ.
2 E nwere ike ịrụ ọrụ ụbọchị isii, ma ụbọchị nke asaa ga-adịrị unu nsọ. Ọ bụ ụbọchị izu ike a ga-edebere Jehova, nke a ga-ezu naanị ike na ya.+ Onye ọ bụla rụrụ ọrụ n’ụbọchị ahụ, a ga-egbu ya.+