24 ‘Ị rụụrụ onwe gị ebe dị mkputamkpu, rụọkwara onwe gị ebe dị elu n’ámá ọ bụla. 25 Ị rụrụ ebe ndị dị elu n’ebe anya ndị mmadụ kacha aga n’okporo ámá ọ bụla. I mekwara ka mma ị mara bụrụ ihe rụrụ arụ, n’ihi na ị na-enye onye ọ bụla na-agafe agafe onwe gị,+ na-agba akwụna gị n’esepụghị aka.+