40 Ha ga-ekwupụtazi mmehie ha+ na mmehie ndị nna nna ha, kwupụtakwa na ndị nna nna ha bụ ndị a na-ekwesịghị ịtụkwasị obi. Ha ga-ekwetakwa na ha bụ ndị a na-ekwesịghị ịtụkwasị obi nakwa na ha nupụụrụ m isi.+
9 Ndị unu a na-egbughị ga-echeta m ná mba niile a dọọrọ ha n’agha laa.+ Ha ga-aghọta na ezigbo iwe ji m maka na ha hapụrụ m,* gbakụta m azụ,+ na-achọkwa ka ha na arụsị ha niile na-asọ oyi kwaa iko.+ Ihere onwe ha ga-eme ha n’ihi ihe ọjọọ niile ha mere nakwa n’ihi arụ niile ha kpara.+
61 Ị ga-echeta ihe i mere, ihere ga-emekwa gị+ mgbe ị ga-anabata ụmụnne gị ndị nwaanyị, ma ndị tọrọ gị ma ndị ị tọrọ. M ga-akpọnyekwa gị ha ka ha bụrụ ụmụ gị, ma ọ bụghị n’ihi ndụ mụ na gị gbara.’