-
Ezikiel 5:12, 13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 Ma ọrịa na-efe efe ma ụnwụ ga-ala otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime unu n’iyi. A ga-eji mma agha gbuo otu ụzọ n’ụzọ atọ ọzọ gburugburu obodo a.+ M ga-achụsasị otu ụzọ n’ụzọ atọ fọrọnụ ebe niile. M ga-amịrịkwa mma agha chụwa ha.+ 13 M mechaa ha ihe a iji gosi na iwe ji m, obi ga-ajụrụ m. Iwe m ga-adajụ, obi ga-adịkwa m mma.+ Ha ga-amarakwa na mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe ndị a n’ihi na m chọrọ ka a na-efe naanị m.+
-