6 Mosis wee gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ndị nke ọzọ, bụ́ Elieza na Ịtama, sị: “Unu ahapụla isi unu n’edozighị ya edozi, unu adọwakwala uwe unu,+ ka unu ghara ịnwụ, ka Chineke gharakwa iwesa nzukọ a niile iwe. Ụmụnne unu, bụ́ ezinụlọ Izrel niile, ga-ebere ndị a Jehova ji ọkụ gbuo ákwá.