-
Ezikiel 28:12, 13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 “Nwa nke mmadụ, bụọ abụ iru uju banyere eze Taya. Sị ya, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị:
13 Ị nọbu n’Iden, bụ́ ubi Chineke.
E ji nkume niile dị oké ọnụ* chọọ uwe gị mma.
Ha bụ: rubi, topaz, jaspa, krisolaịt, ọnịks, jed, safaya, tọkwọiz,+ na emerad.
Ebe a kwụnyere nkume ndị a nakwa oghere ndị ha dị na ha bụ ọlaedo.
M mere ha n’ụbọchị m kere gị.
-