-
Ezikiel 30:10, 11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘M ga-esi n’aka Nebukadneza* eze Babịlọn kpochapụ ọtụtụ ndị n’Ijipt.+ 11 A ga-akpọta ya na ndị agha ya, bụ́ ndị obi kacha fee azụ ná mba niile,+ ka ha bịa laa Ijipt n’iyi. Ha ga-amịpụta mma agha ha lụso Ijipt agha. Ndị ha gburu ga-ejukwa ebe niile n’ala Ijipt.+
-