39 “Ị chịchaa, alaeze ọzọ nke na-erughị ka nke gị ga-amalite ịchị.+ A ga-enwekwa alaeze ọzọ nke ga-achị ụwa niile.+ Ọ bụ ya ga-abụ nke atọ, ya bụ, nke ọla kọpa.
5 Ka m nọ na-ele ihe na-emenụ, m hụrụ otu mkpi+ nke si n’ebe ọdịda anyanwụ na-agazu ụwa niile, ma ụkwụ ya anaghị emetụ n’ala. Mkpi ahụ nwere otu mpi a na-ahụ nke ọma nke dị n’agbata anya ya abụọ.+