8 Ka m nọ na-ele mpi ndị ahụ ma na-eche banyere ha, m hụrụ ka obere mpi ọzọ+ pulitere n’etiti ha. E fopụkwara mpi atọ n’ime mpi ndị mbụ ahụ n’ihu ya. Lee, anya ndị yiri anya mmadụ dị n’obere mpi a, e nwekwara ọnụ dị na ya nke na-etu ọnụ.+
25 Ọ ga-ekwutọ Onye Kacha Elu,+ ọ ga na-enyekwa ndị nsọ nke Onye Kacha Elu nsogbu. Ọ ga-achọ ka ọ gbanwee oge na iwu, a ga-enyefekwa ha n’aka ya ruo otu oge, oge abụọ, na ọkara otu oge.*+