2 Ma Fero sịrị: “Ònye bụ Jehova,+ nke mere m ga-eji rubere ya isi wee hapụ ndị Izrel ka ha gawa?+ Amaghị m onye Jehova bụ, agaghịkwa m ahapụ ndị Izrel.”+
15 Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu ma ọ bụ si otú a rafuo unu.+ Unu atụkwasịkwala ya obi, n’ihi na ọ dịghị chi mba ọ bụla ma ọ bụ chi alaeze ọ bụla nwere ike ịnapụta ndị ya n’aka m ma ọ bụ n’aka nna nna m hà. Oleezi otú Chineke unu ga-esi napụta unu n’aka m?’”+