-
Jenesis 32:24-26Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
24 Jekọb mechaziri nọrọ naanị ya. Ya na otu nwoke wee malite ịgba mgba ruo mgbe chi bọrọ.+ 25 Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ya emerighị Jekọb, o metụrụ Jekọb aka n’ọkpụkpụ úkwù ya, úkwù Jekọb wee chipụ ka ya na ya na-agba mgba.+ 26 Nwoke ahụ sịziri Jekọb: “Hapụ m ka m laa maka na chi abọwala.” Jekọb wee sị ya: “Agaghị m ahapụ gị ka ị laa ruo mgbe ị gọziri m.”+
-