-
Ọrụ Ndịozi 2:16-18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 Kama, ọ bụ ihe Joel buru n’amụma na-emezu n’isi ha. Ọ sịrị: 17 ‘Chineke kwuru, sị, “N’oge ikpeazụ, m ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị mmadụ ọ bụla. Ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị ga-ebukwa amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụụ, ndị agadi nwoke unu ga-arọkwa nrọ.+ 18 N’oge ahụ, m ga-awụkwasịkwa mmụọ m n’ahụ́ ndị ohu m ndị nwoke nakwa n’ahụ́ ndị ohu m ndị nwaanyị, ha ga-ebukwa amụma.+
-