Diuterọnọmi 25:13 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 13 “Enwela ụdị nkume abụọ e ji atụ̀ ihe n’akpa gị,+ nke ukwu na nke nta. Ilu 11:1 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 11 Jehova kpọrọ ihe na-ezughị ezu e ji atụ̀ ihe asị,Ma ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe* na-adị ya mma.+ Hosia 12:7 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 7 Ma, ihe onye ahịa ji n’aka ya bụ ihe wayo e ji atụ̀ ihe. Ịghọgbu ndị mmadụ na-atọ ya ụtọ.+