-
Ezikiel 34:16, 17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 M ga-achọ nke furu efu,+ dughachite nke kpafuru akpafu, kee ọkpụkpụ nke gbajiri agbaji ákwà, meekwa ka nke ike na-adịghị dị ike. Ma, m ga-ala nke buru ibu na nke dị ike n’iyi. M ga-ekpe ha ikpe, taakwa ha ahụhụ kwesịịrị ha.”
17 “‘Ma ununwa bụ́ atụrụ m, mụnwa bụ́ Ọkaakaa Onyenwe unu bụ́ Jehova kwuru, sị: “M na-aga ikpere otu atụrụ na ibe ya ikpe, kpeekwara ebule na mkpi.+
-