2 Jeshụa+ nwa Jehozadak na ndị nchụàjà ibe ya nakwa Zerubabel+ nwa Shieltiel+ na ụmụnne ya biliri rụọ ebe ịchụàjà nke Chineke Izrel, ka ha nwee ike ịna-achụ àjà a na-esu ọkụ na ya, otú e dere n’Iwu Mosis,+ onye nke ezi Chineke.
1N’afọ nke abụọ n’ọchịchị Eze Darayọs, n’ọnwa nke isii, n’abalị mbụ n’ọnwa ahụ, Jehova si n’ọnụ Hagaị*+ onye amụma gwa gọvanọ Juda bụ́ Zerubabel+ nwa Shieltiel na nnukwu onye nchụàjà bụ́ Joshụa nwa Jehozadak, sị: