-
Levitikọs 26:14-17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 “‘Ma ọ bụrụ na unu agaghị ege m ntị ma ọ bụ ghara idebe iwu ndị a niile,+ 15 ọ bụrụkwa na unu ajụ ime ihe m kwuru,+ unu* ewee kpọọ ihe m kpebiri ka unu na-eme asị ma ghara ime ihe niile m nyere n’iwu, unu emebiekwa ọgbụgba ndụ m,+ 16 m ga-eme unu ihe ndị a: m ga-ata unu ahụhụ, mee ka unu rịa ụkwara nta na oké ahụ́ ọkụ, bụ́ ndị ga-eme ka unu ghara ịna-ahụ ụzọ nakwa ka ike gwụ unu.* Unu ga-agha mkpụrụ n’efu n’ihi na ọ bụ ndị iro unu ga-eri ya.+ 17 M ga-ajụ unu, ndị iro unu ga-emerikwa unu.+ Ndị kpọrọ unu asị ga-emegbu unu.+ Unu ga-agbakwa ọsọ mgbe a na-enweghị onye na-achụ unu.+
-