Diuterọnọmi 24:1 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 24 “Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị, ma nwaanyị ahụ amasịghịzi ya maka na ọ chọpụtara na nwaanyị ahụ mere ihe na-eme ihere, nwoke ahụ ga-edere ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm,+ were ya nye ya ma chụpụ ya n’ụlọ ya.+ Matiu 19:3 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 3 Ndị Farisii wee bịakwute ya ka ha nwaa ya. Ha sịrị ya: “Ọ̀ dị mma ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm n’ihi ụdị ihe ọ bụla?”+ Matiu 19:8 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 8 O wee sị ha: “Mosis kwetara ka unu na-agba nwunye unu alụkwaghịm n’ihi na obi kpọrọ unu nkụ.+ Ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị ná mmalite.+ Mak 10:2 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 2 Ndị Farisii bịakwutere ya ka ha nwaa ya. Ha jụrụ ya ma ọ̀ dị mma ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm.+ Mak 10:4 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 4 Ha sịrị: “Mosis kwere ka nwoke dee akwụkwọ ọ ga-eji chụpụ nwunye ya ma gbaa ya alụkwaghịm.”+
24 “Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị, ma nwaanyị ahụ amasịghịzi ya maka na ọ chọpụtara na nwaanyị ahụ mere ihe na-eme ihere, nwoke ahụ ga-edere ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm,+ were ya nye ya ma chụpụ ya n’ụlọ ya.+
3 Ndị Farisii wee bịakwute ya ka ha nwaa ya. Ha sịrị ya: “Ọ̀ dị mma ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm n’ihi ụdị ihe ọ bụla?”+
8 O wee sị ha: “Mosis kwetara ka unu na-agba nwunye unu alụkwaghịm n’ihi na obi kpọrọ unu nkụ.+ Ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị ná mmalite.+
2 Ndị Farisii bịakwutere ya ka ha nwaa ya. Ha jụrụ ya ma ọ̀ dị mma ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm.+