32 “Ọ bụrụkwa na ọ bụ ndị hụrụ unu n’anya ka unu hụrụ n’anya, olee oké ihe unu mere? N’ihi na ndị mmehie hụkwara ndị hụrụ ha n’anya n’anya.+ 33 Ọ bụrụkwa na ọ bụ ndị na-emere unu ihe ọma ka unu na-emere ihe ọma, olee oké ihe unu mere? Ndị mmehie na-emekwa otu ihe ahụ.