29 N’ihi ya, kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere ihe unu ga-eri na ihe unu ga-aṅụ. Kwụsịkwanụ iche oké echiche,+ 30 n’ihi na ihe ndị a niile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsi ike. Ma, Nna unu ma na ihe ndị a dị unu mkpa.+ 31 Kama, na-achọnụ Alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a.+