-
Luk 13:25-27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 Ọ bụrụ na onyeisi ezinụlọ ebilie kpọchie ụzọ, unu ga-eguzoro n’èzí na-akụ aka n’ụzọ, sị, ‘Onyenwe anyị, megheere anyị ụzọ.’+ Ma ọ ga-asị unu: ‘Amaghị m ebe unu si.’ 26 Unu ga-amalitekwa ịsị, ‘Anyị na gị rikọrọ ihe, ṅụkọọkwa ihe, i zikwara ihe n’okporo ámá anyị.’+ 27 Ma ọ ga-asị unu, ‘Amaghị m ebe unu si. Sinụ ebe m nọ pụọ. Unu bụ ndị ajọ omume.’
-