Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Mak 2:3-12
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 3 Ndị mmadụ butekwaara ya otu onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ bụ mmadụ anọ bu ya.+ 4 Ma, ha enweghị ike iburute ya n’ebe Jizọs nọ n’ihi ìgwè mmadụ ahụ. Ha wee meghee elu ụlọ ebe Jizọs nọ, si n’oghere ha gwupuru buda àkwà* onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ dina na ya. 5 Mgbe Jizọs hụrụ na ha nwere okwukwe,+ ọ sịrị onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ: “Nwa m, a gbagharala gị mmehie gị.”+ 6 Ma ụfọdụ ndị odeakwụkwọ nọ ọdụ n’ebe ahụ, ha nọ na-eche n’obi ha, sị:+ 7 “Gịnị mere nwoke a ji na-ekwu okwu otú a? Ọ na-ekwulu Chineke. Ònye ga-agbagharali mmehie ma e wepụ otu onye, ya bụ, Chineke?”+ 8 Ma ozugbo ahụ, Jizọs matara na ọ bụ ihe ahụ ka ha na-eche ma na-ekwurịta. O wee sị ha: “Gịnị mere unu ji na-eche ihe ndị a n’obi unu?+ 9 Olee nke ka mfe? Ọ̀ bụ ịsị onye a ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, ‘A gbagharala gị mmehie gị,’ ka ọ̀ bụ ịsị ya, ‘Bilie, buru ihe i ji edina ala gawa ije’? 10 Ma, ka unu wee mara na Nwa nke mmadụ+ nwere ikike ịgbaghara mmehie n’ụwa—”+ ọ gwara onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: 11 “Ana m asị gị, Bilie, buru àkwà gị lawa n’ụlọ gị.” 12 O wee bilie, buru ihe o ji edina ala ozugbo ma si n’ihu ha niile pụọ. Ihe a juru ha niile anya. Ha tokwara Chineke, sị: “Anyị ahụtụbeghị ụdị ihe a.”+

  • Luk 5:18-26
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 18 Ma, e nwere ụmụ nwoke ji àkwà* buru otu nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ha nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi bubata ya ma dọwa ya n’ihu Jizọs.+ 19 Ma, n’ihi ìgwè mmadụ ahụ, ha ahụghị ụzọ ha ga-esi buba ya. N’ihi ya, ha rịgooro n’elu ụlọ, sikwa n’uko ụlọ buda ya na àkwà ahụ n’etiti ndị nọ n’ihu Jizọs. 20 Mgbe Jizọs hụrụ na ha nwere okwukwe, ọ sịrị: “Nwoke m, a gbagharala gị mmehie gị.”+ 21 Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii wee malite ịgwa ibe ha, sị: “Ònye bụ onye a na-ekwulu Chineke? Ònye ga-agbagharali mmehie ma ọ́ bụghị naanị Chineke?”+ 22 Ma ebe ọ bụ na Jizọs ma ihe ha na-eche, ọ gwara ha, sị: “Gịnị ka unu na-eche n’obi unu? 23 Olee nke ka mfe? Ọ̀ bụ ịsị, ‘A gbagharala gị mmehie gị,’ ka ọ̀ bụ ịsị, ‘Bilie gawa ije’? 24 Ma, ka unu wee mara na Nwa nke mmadụ nwere ikike n’ụwa ịgbaghara mmehie—” ọ gwara nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Ana m asị gị, Bilie buru àkwà* gị, lawa n’ụlọ gị.”+ 25 O wee bilie n’ihu ha, buru àkwà* ya lawa n’ụlọ ya, na-eto Chineke. 26 O wee ju ha niile anya, ha amalitekwa ito Chineke. Egwu wee jide ha, ha ana-asị: “Anyị ahụla ihe dị ebube taa.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya