14 Unu atamula ntamu+ ma ọ bụ na-arụrịta ụka+ n’ihe ọ bụla unu na-eme, 15 ka unu wee bụrụ ndị a na-anaghị ata ụta na ndị aka ha dị ọcha, ụmụ Chineke+ ndị na-emerụghị onwe ha n’ọgbọ a jọgburu onwe ya, nke rụkwara arụ.+ Ma unu na-enwu ka ìhè n’etiti ha n’ụwa a,+