-
Luk 7:18-23Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 Ndị na-eso ụzọ Jọn kọkwaara ya ihe a niile.+ 19 N’ihi ya, Jọn kpọrọ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ma zie ha ka ha gakwuru Onyenwe anyị, sị ya: “Ọ̀ bụ gị bụ Onye anyị na-atụ anya ya kemgbe,+ ka è nwere onye ọzọ ga-abịa?” 20 Mgbe ụmụ nwoke ahụ bịakwutere ya, ha sịrị ya: “Jọn Onye Na-eme Baptizim ziri anyị ka anyị bịa jụọ gị, sị, ‘Ọ̀ bụ gị bụ Onye anyị na-atụ anya ya kemgbe, ka è nwere onye ọzọ ga-abịa?’” 21 N’oge ahụ, ọ gwọrọ ọtụtụ mmadụ ọrịa dị iche iche ha na-arịa,+ chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, meekwa ka ọtụtụ ndị ìsì hụwa ụzọ. 22 O wee sị ha: “Gaanụ kọọrọ Jọn ihe unu hụrụ na ihe unu nụrụ: Ndị ìsì na-ahụzi ụzọ,+ ndị ngwọrọ na-ejekwa ije. A na-eme ka ndị ekpenta dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụkwa ihe.+ A na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, a na-ezikwa ndị ogbenye ozi ọma.+ 23 Onye ihe gbasara m na-anaghị eme obi abụọ* na-enwe obi ụtọ.”+
-