23 O wee gwa ndị na-eso ụzọ ya mgbe naanị ya na ha nọ, sị: “Ndị na-ahụ ihe ndị unu na-ahụ na-enwe obi ụtọ.+ 24 N’ihi na ana m asị unu, ọtụtụ ndị amụma na ndị eze chọrọ ịhụ ihe ndị unu na-ahụ, ma ha ahụghị ha,+ ha chọkwara ịnụ ihe ndị unu na-anụ, ma ha anụghị ha.”