29 Ma ozugbo nwa ahụ seere aka ya, nwanne ya nwoke pụtara. Nwaanyị na-aghọ́ nwa wee tie mkpu, sị: “Legodị otú ahụ́ nne gị si gbawaa mgbe ị na-apụta!” N’ihi ya, a gụrụ ya Pirez.+ 30 Mgbe e mechara, nwanne ya ahụ e kere ibé ákwà na-acha uhie uhie n’aka pụtara, a gụọ ya Zira.+