-
Mak 8:13-21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 O wee hapụ ha, banyeghachi n’ụgbọ, ma gaa n’ofe nke ọzọ nke oké osimiri ahụ.
14 Ma, ndị na-eso ụzọ ya chefuru iwere achịcha. Naanị ihe ha nwere n’ụgbọ ahụ bụ otu ogbe achịcha.+ 15 Jizọs dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya. Kpacharanụ anya maka ihe iko achịcha ndị Farisii na ihe iko achịcha Herọd.”+ 16 Ha wee malite ịrụrịta ụka maka na ha ejighị achịcha. 17 Mgbe ọ hụrụ na ha na-arụrịta ụka, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji arụrịta ụka maka na unu ejighị achịcha? Ọ̀ bụ na unu aghọtabeghị ihe m na-ekwu? Ọ̀ ka na-esiri obi unu ike ịghọta ihe? 18 ‘Ọ̀ bụ na unu anaghị ahụ ụzọ n’agbanyeghị na unu nwere anya? Ọ̀ bụ na unu anaghị anụ ihe n’agbanyeghị na unu nwere ntị?’ Ọ̀ bụ na unu echetaghị 19 mgbe m nyawaara puku ụmụ nwoke ise (5,000) ogbe achịcha ise?+ Nkata ole ka unu tụtụjuru ibé achịcha e rifọrọ erifọ?” Ha sịrị ya: “Iri na abụọ.”+ 20 “Mgbe m nyawaara puku ụmụ nwoke anọ (4,000) ogbe achịcha asaa, nnukwu nkata ole ka unu tụtụjuru ibé achịcha e rifọrọ erifọ?” Ha asị ya: “Asaa.”+ 21 O wee sị ha: “Ọ̀ bụ na unu aghọtabeghị ihe m na-ekwu?”
-