-
Luk 15:3-7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 O wee meere ha ihe atụ a: 4 “Ònye n’ime unu nke nwere otu narị (100) atụrụ, ka ọ ga-abụ, otu n’ime ha fuo, ya aghara ịhapụ iri itoolu na itoolu n’ala ịkpa gaa chọwa nke ahụ furu efu ruo mgbe ọ chọtara ya?+ 5 Mgbe ọ chọtara ya, ọ na-ekukwasị ya n’ubu ya ma na-aṅụrị ọṅụ. 6 Ya laruokwa, ọ na-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbata obi ya, sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na achọtala m atụrụ m furu efu.’+ 7 Ana m asị unu na otú ahụ ka a ga-aṅụrị ọṅụ n’eluigwe ma otu onye mmehie chegharịa+ karịa ka a ga-aṅụrị n’ihi ndị ezi omume iri itoolu na itoolu ndị nchegharị na-adịghị mkpa.
-