-
Mak 11:27-33Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
27 Ha bịara Jeruselem ọzọ. Ka ọ na-agagharị n’ụlọ nsọ, ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na ndị okenye bịara, 28 sị ya: “Ebee ka i si nweta ikike i ji eme ihe ndị a? Ma ọ bụ, ònye nyere gị ikike ime ihe ndị a?”+ 29 Jizọs sịrị ha: “M ga-ajụ unu otu ajụjụ. Unu zaa m ya, m ga-agwazi unu ebe ikike m ji na-eme ihe ndị a si. 30 Ikike Jọn ji mee ndị mmadụ baptizim+ ò si n’eluigwe ka ò si n’aka mmadụ? Zaanụ m ya.”+ 31 Ha wee malite ịgwa ibe ha, sị: “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’eluigwe,’ ọ ga-asị, ‘Gịnịzi mere na unu ekwetaghị ihe o kwuru?’ 32 Ma anyị agaghị anwa anwa sị, ‘O si n’aka mmadụ.’” Ha na-atụ ìgwè mmadụ ahụ egwu n’ihi na ha niile kwetara n’eziokwu na Jọn bụ onye amụma.+ 33 N’ihi ya, ha zara Jizọs, sị: “Anyị amaghị.” Jizọs sịziri ha: “M gaghịkwa agwa unu ebe ikike m ji eme ihe ndị a si.”
-
-
Luk 20:1-8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-ezi ndị mmadụ ihe n’ụlọ nsọ ma na-ezisa ozi ọma, ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na ndị okenye bịara 2 sị ya: “Gwa anyị, Ebee ka i si nweta ikike i ji eme ihe ndị a? Ma ọ bụ, ònye nyere gị ikike ime ihe ndị a?”+ 3 Ya asị ha: “M ga-ajụkwa unu otu ajụjụ, unu zaakwa m: 4 Baptizim Jọn mere ndị mmadụ, ò si n’eluigwe, ka ò si n’aka mmadụ?” 5 Ha gwara ibe ha, sị: “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’eluigwe,’ ọ ga-asị, ‘Gịnị mere na unu ekwetaghị ihe o kwuru?’ 6 Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’aka mmadụ,’ ndị a niile ga-atụ anyị nkume, n’ihi na ha kweere na Jọn bụ onye amụma.”+ 7 N’ihi ya, ha sịrị na ha amaghị ebe o si. 8 Jizọs wee sị ha: “M gaghịkwa agwa unu ebe ikike m ji eme ihe ndị a si.”
-