-
Matiu 6:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 “Lezienụ anya ka unu ghara ịna-eme ezi omume unu n’ihu ndị mmadụ ka ha wee hụ unu,+ ma ọ́ bụghị ya, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ n’aka Nna unu nke nọ n’eluigwe. 2 N’ihi ya, mgbe ị na-enye onyinye ebere,* afụla opi na-aga, dị ka ndị ihu abụọ na-eme n’ụlọ nzukọ na n’okporo ámá, ka ndị mmadụ wee too ha. N’eziokwu, ana m asị unu, ha enwetazuola ụgwọ ọrụ ha.
-