20 Chetanụ okwu m gwara unu: Ohu anaghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu.+ Ọ bụrụ na ha mere ihe m kwuru, ha ga-emekwa ihe unu kwuru.
19 Mgbe e gbuchara Stivin, a malitekwara ịkpagbu ndị kwere ekwe ndị ọzọ. N’ihi ya, ha gbagara+ Finishia, Saịprọs, na Antiọk. Ma, ọ bụ naanị ndị Juu ka ha nọ na-ezi ozi ọma.+
10 Ụjọ atụla unu maka ahụhụ unu na-aga ịta.+ Ekwensu ga na-eme ka a tụọ ụfọdụ n’ime unu mkpọrọ ka o wee nwaa unu ruo n’isi, kpagbuokwa unu ruo ụbọchị iri. Kwụsienụ ike n’ebe m nọ ruo mgbe unu nwụrụ, m ga-enyekwa unu okpueze bụ́ ndụ.+