-
Mak 13:21-23Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
21 “Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọ bụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ n’ebe a,’ ma ọ bụ ‘Lee, ọ nọ n’ebe ahụ,’ unu ekwela.+ 22 N’ihi na a ga-enwe Kraịst ụgha dị iche iche na ndị amụma ụgha.+ Ha ga na-arụ ọrụ ebube ma na-eme ihe ịtụnanya dị iche iche iji duhie ndị Chineke họọrọ, ma o kwe ha omume. 23 N’ihi ya, lezienụ anya.+ Agwala m unu ihe niile tupu oge ha ga-eme eruo.
-