2 Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’Izrel otú ahụ ụfọdụ n’ime unu ga-abụkwa ndị nkụzi ụgha.+ Ha ga-eji nwayọọ malite òtù dị iche iche ga-eme ka unu kwụsị inwe okwukwe. Ha ga-agọnahụkwa onye gbapụtara ha.+ A ga-ebibikwa ha ngwa ngwa n’ihi ihe a ha ga-eme.