24 “Ọ gwaziri ndị guzo n’akụkụ, sị, ‘Natanụ ya maịna ahụ nye onye ahụ nke nwere maịna iri.’+ 25 Ma ha sịrị ya, ‘Onyenwe anyị, o nwekwaranụ maịna iri.’— 26 ‘Ana m asị unu, onye ọ bụla nke nwere ihe, a ga-enyekwu ya. Ma onye na-enweghị, a ga-anapụdị ya nke o nwere enwe.+