-
Mak 15:11-14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 Ma ndị isi nchụàjà ahụ mere ka ìgwè mmadụ ahụ mewe aghara ka ọ hapụrụ ha Barabas, kama ịhapụ Jizọs.+ 12 Paịlet gwara ha ọzọ, sị: “Gịnịzi ka m ga-eme onye unu na-akpọ Eze ndị Juu?”+ 13 Ha tiri mkpu ọzọ, sị: “Kwụwa ya n’osisi!”*+ 14 Ma Paịlet gwara ha, sị: “Maka gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tikwuru mkpu, sị: “Kwụwa ya n’osisi!”*+
-