18 N’ihi ya, na-egenụ ntị nke ọma, n’ihi na onye ọ bụla nke nwere ihe ka a ga-enyekwu.+ Ma onye ọ bụla na-enweghị, a ga-anapụdị ya nke o chere na ya nwere.”+
25 Ma onye na-enyocha iwu Chineke, nke zuru okè,+ nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, onye na-emekwa ihe o kwuru, abụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ. Ọ bụ onye na-arụ ọrụ Chineke sị ka a rụọ. Ọ ga-enwekwa obi ụtọ ma ọ na-arụ ya.+