-
Matiu 14:1-5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 N’oge ahụ, Herọd, onye na-achị ógbè ahụ, nụrụ akụkọ banyere Jizọs+ 2 wee gwa ndị na-ejere ya ozi, sị: “Onye a bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim. A kpọlitela ya n’ọnwụ. Ọ bụ ya mere o ji na-arụ ọrụ ebube ndị a.”+ 3 Herọd* jidere Jọn, kee ya agbụ, tụọ ya mkpọrọ n’ihi Herodias nwunye Filip nwanne ya.+ 4 N’ihi na Jọn nọ na-asị ya: “Ọ dịghị mma na ị kpọọrọ ya lụwa.”+ 5 Ma, ọ bụ eziokwu na ọ chọrọ igbu ya, ọ tụrụ egwu ndị mmadụ, n’ihi na ha weere na Jọn bụ onye amụma.+
-
-
Luk 9:7-9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Herọd* onye na-achị ógbè ahụ wee nụ ihe niile na-emenụ. Ihe a niile gbakwara ya gharịị n’ihi na ụfọdụ nọ na-asị na a kpọlitela Jọn n’ọnwụ.+ 8 Ma ndị ọzọ na-asị na Ịlaịja apụtala, ndị ọzọ ana-asịkwa na otu n’ime ndị amụma oge ochie esila n’ọnwụ bilie.+ 9 Herọd sịrị: “Ọ bụ m gbupụrụ Jọn isi.+ Ònyezi bụ onye a m na-anụ ọtụtụ ihe gbasara ya?” N’ihi ya, ọ nọ na-achọsi ike ịhụ onye ọ bụ.+
-