49 Onye ahụ na-ejere eze ozi sịrị ya: “Onyenwe anyị, bịa tupu obere nwa m anwụọ.” 50 Jizọs sịrị ya: “Lawa, nwa gị agbakeela.”+ Nwoke ahụ kwetara ihe Jizọs gwara ya wee lawa. 51 Ma ka ọ nọ n’ụzọ na-ala, ndị ohu ya zutere ya ka ha gwa ya na nwa ya nwoke agbakeela.