-
Levitikọs 14:3, 4Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 Onye nchụàjà ga-esi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu pụọ gaa leruo ya anya. Ọ bụrụ na ekpenta ya alaala, 4 onye nchụàjà ga-enye ya iwu ka ọ nwụta nnụnụ abụọ dị ndụ bụ́ ndị na-esoghị ná nnụnụ ndị na-adịghị ọcha, wetakwa osisi sida, ákwà na-acha uhie uhie, na ahịhịa hisop ka e jiri ha mee ka ọ dị ọcha.+
-
-
Levitikọs 14:10, 11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 “N’ụbọchị nke asatọ, ọ ga-akpụta ebule abụọ ahụ́ dị mma, otu nne atụrụ ahụ́ dị mma+ nke na-agafebeghị otu afọ, butekwa ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka,+ nakwa otu lọg* mmanụ.+ 11 Onye nchụàjà nke kwuru na onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha adịla ọcha ga-akpọta ya n’ihu Jehova n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, wetakwa ihe ndị o wetara.
-