-
Matiu 26:47-51Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
47 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, Judas, otu n’ime ndịozi ya iri na abụọ, bịara, ya na ìgwè mmadụ ndị ji mma agha na okpiri. Ọ bụ ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu dunyere ha.+
48 Onye ga-arara ya nye nyere ha ihe àmà, sị: “Onye ọ bụla m susuru ọnụ, ọ bụ ya. Jidenụ ya.” 49 O wee gakwuru Jizọs, sị: “Onye Ozizi,* ndeewo.” O wee jiri nwayọọ susuo ya ọnụ. 50 Ma Jizọs sịrị ya: “Enyi, gịnị mere i ji bịa ebe a?”+ Ha wee bịa jide Jizọs, kpụrụ ya. 51 Ma, otu n’ime ndị so Jizọs mịịrị mma agha ya, gbuo ya ohu nnukwu onye nchụàjà, bepụ ya ntị.+
-
-
Luk 22:47-51Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
47 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, ìgwè mmadụ bịara, nwoke ahụ a na-akpọ Judas, bụ́ otu n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ, dukwa ha. O wee bịaruo Jizọs nso ka o susuo ya ọnụ.+ 48 Ma Jizọs sịrị ya: “Judas, ì ji isusu ọnụ arara Nwa nke mmadụ nye?” 49 Mgbe ndị nọ ya gburugburu hụrụ ihe na-aga ime, ha sịrị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ anyị jiri mma agha lụso ha ọgụ?” 50 Otu onye n’ime ha gbudịrị ohu nnukwu onye nchụàjà mma, bepụ ntị aka nri ya.+ 51 Ma Jizọs sịrị: “O zuolanụ.” O wee bitụ ntị nwoke ahụ aka, gwọọ ya.
-