-
Jọn 19:23, 24Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
23 Mgbe ndị agha ahụ kpọgidere Jizọs n’osisi, ha chịịrị uwe elu ya ma kee ya ụzọ anọ, otu ụzọ maka otu onye agha. Ha chịkwaara uwe ime ya. Ma uwe ime ya enweghị ebe a dụkọtara ya n’ihi na a kpara ya akpa si n’elu ruo n’ala. 24 Ha gwara ibe ha, sị: “Ka anyị ghara ịdọwa ya adọwa, kama ka anyị fee nza iji mata onye ọ ga-abụ nke ya.”+ Ihe a bụ ka e wee mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, nke sịrị: “Ha kere uwe m, ha fekwaara uwe m nza.”+ Ndị agha ahụ mere ihe ndị a n’eziokwu.
-