-
Matiu 8:28, 29Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
28 Mgbe o ruru n’ofe nke ọzọ, n’obodo ndị Gadara, ya na mmadụ abụọ mmụọ ọjọọ ji, ndị si n’ebe a na-eli ozu na-apụta,+ zuru n’ụzọ. Ha na-akpa ajọ ike, nke na ọ dịghị onye egwu na-ekwe ịgafe n’ụzọ ahụ. 29 Ma, ha tiri mkpu, sị: “Ọkpara Chineke,+ gịnị jikọrọ anyị na gị? Ị̀ bịara ebe a imekpa anyị ahụ́+ tupu oge a kara aka eruo?”+
-