11 N’ihi ya, ọ bụrụ na unu ma otú e si enye ụmụ unu ezigbo onyinye, ọ bụ eziokwu na unu bụ ndị ajọ omume, ọ̀ bụ na Nna unu nke nọ n’eluigwe agaghị enye ndị na-arịọ ya ihe ọma+ ha na-arịọ ya?+
17 Ọ bụ n’eluigwe ka anyị si enweta onyinye ọ bụla dị mma, nke zukwara okè.+ Ọ na-esi n’aka Chineke, bụ́ Nna kere ìhè na-esi n’eluigwe, abịa.+ Chineke adịghị ka onyinyo na-anaghị anọ otu ebe, nke na-agbanwekwa agbanwe.+