22 “Anya dị ka ihe na-enye ahụ́ ìhè.+ N’ihi ya, ọ bụrụ na anya gị na-elegide otu ebe, ahụ́ gị niile ga-abụ ìhè ìhè. 23 Ma ọ bụrụ na ihe anya gị na-ahụ na-eme ka ị bụrụ onye anyaụfụ,+ ahụ́ gị niile ga-agba ọchịchịrị. Ọ bụrụ n’eziokwu na ìhè dị n’ime gị bụ ọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ agaghị enwe atụ.