31 “Ọ bụ ya mere m ji asị unu na a ga-agbaghara ụmụ mmadụ ụdị mmehie na nkwulu ọ bụla, ma a gaghị agbaghara nkwulu e kwuluru mmụọ nsọ.+ 32 Dị ka ihe atụ, onye ọ bụla nke kwuluru Nwa nke mmadụ, a ga-agbaghara ya.+ Ma, onye ọ bụla nke kwuluru mmụọ nsọ, a gaghị agbaghara ya, ma n’oge a ma n’ọdịnihu.+