-
Jems 4:13-16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị na-asị: “Taa ma ọ bụ echi, anyị ga-eje obodo dị otú a, nọọ otu afọ ebe ahụ, zụọ ahịa, ritekwa uru,”+ 14 ma unu amaghị ihe ndụ unu ga-abụ echi.+ N’ihi na unu dị ka alụlụụ nke ọ na-abụ, ya pụta, obere oge a gaghịzi ahụ ya.+ 15 Kama ikwu otú ahụ, unu kwesịrị ịsị: “Ọ bụrụ uche Jehova,*+ anyị ga-adị ndụ mee nke a ma ọ bụ nke ọzọ.” 16 Ma ugbu a, unu na-akpa nganga, na-etukwa ọnụ. Ụdị ọnụ a unu na-etu adịghị mma.
-