Jọn 5:28, 29 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 28 Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya+ 29 wee pụta. Ndị mere ezi ihe ga-esi n’ọnwụ bilie ka ha dị ndụ,* ma ndị mere ihe ọjọọ ga-esi n’ọnwụ bilie ka e kpee ha ikpe.*+ Jọn 11:24 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 24 Mata wee sị ya: “Ama m na ọ ga-ebili mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ+ n’ụbọchị ikpeazụ.” Ọrụ Ndịozi 24:15 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 15 Enwekwara m olileanya otú ndị a nwere, na Chineke ga-akpọlite ndị ezi omume na ndị ajọ omume nwụrụ anwụ.+
28 Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya+ 29 wee pụta. Ndị mere ezi ihe ga-esi n’ọnwụ bilie ka ha dị ndụ,* ma ndị mere ihe ọjọọ ga-esi n’ọnwụ bilie ka e kpee ha ikpe.*+
15 Enwekwara m olileanya otú ndị a nwere, na Chineke ga-akpọlite ndị ezi omume na ndị ajọ omume nwụrụ anwụ.+